Gịnị bụ uche nke isii?

1. Gịnị bụ uche nke isii?

Uche nke isii, ma ọ bụ ike ịghọta ihe adịghị ahụ anya, ọ bụ ike anyị ịghọta ụzọ adịghị ahụ anya ma ọ bụ ụwa anaghị ahụ anya nke ndị mmụọ ozi, ndị mmụọ, Eluigwe (Swarga), na ndị ọzọ. Ọ gụnyekwara ike anyị ịghọta ihe adịghị ahụ anya na-akpata na na mmetụta mmekọrịta dị n’azụ ọtụtụ ihe omume, nke karịrị  nghọta nke amamihe. Nghọta Uche ngbakwunye Extrasensory perception (ESP), echiche ihe ga-eme na ọdịnihụ, mmetụta siri ike na o nwere ihe na-achọ ime, Ighọta ihe na echighị ya eche dị ka uche isii ma ọ bụ ike ighọta ihe na-eme adịghị ahụ anya. Na ozi ikuku a niile anyị weere uche isii, Nghọta Uche ngbakwunye(ESP) na ike ịghọta ihe na-eme adịghị ahụ anya ka otu.

2. Kedu ihe anyị ji uche isii enweta ma na-aghọta?

Ndị SSRF kọwara okwu nke ‘ụwa adịghị ahụ anya’ ma ọ bụ ‘ụzọ ime mmụọ’ ka ụwa nke karịrị nghọta nke uche ise, uche na amamihe. Ụwa nke a na-ekwu maka ụwa anaghị ahụ anya nke ndị mmụọ ozi, ndị mmụọ, Eluigwe na ndị ọzọ nke ọ bụ nanị sitena uche nke isii ka eji aghọta ya

Anyị na-aghọta ụwa a ana ahụ anya sitena uche ise nke ahụ ( isi, utọ, ịhụ, mmetụ na ụda), uche anyị (mmetụta anyị ga) na amamihe anyị ( ike ime mkpebi). Mgbe ọ bịara na ụwa nke anaghị ahụ anya ma ọ bụ ụwa dị omimi, anyị na-aghọta ya site na uche ise nke adịghị ahụ anya ya bụ uche ise dị omimi, uche dị omimi na amamihe miri emi – Nke ka amara dị ka uche nke isii anyị. Mgbe uche isii anyị bụrụ ma ọ bụ malite rụba ọrụ, ọ na-enyere anyị aka inweta ihe na-eme na ụwa dị omimi ma ọ bụ na-eme n’ụzọ adịghịahụ anya. Ahụmahụ nke ụwa dị omimi ka a makwara dị ka ‘ahụmahụ ime mmụọ’. Ọ bụ sitena uche nke isii ka ndị na-achọ na SSRF siri nweta ihe ọmụma Chineke banyere isiokkwu dị iche iche dị ka Ndụ mgbe anwụsịrị, Nkpọte ike nke mmata, na Agha Ụwa nke itọ na-abịa.

Ahụmahụ Ahụmahụ ime mmụọ
Gịnị mere? Nwanyị na-esiri isi ụtọ nke roses si na ụyọkọ roses. Nwanyị na-esiri isi ụtọ nke sandalwood mgbe enweghị sandalwood nọ nso.
Ebe o si O doro anya na site na nnukwu ụzọ O doghị anya na site na ụzọ miri emi.
Ụzọ nke esi nweta ya Enwetere ya site na ahụ uche ise, uche, na amamiha. N’imatụ nke a, site na ahụ uche nke isi ya bụ imi. Enwetere ya site na uche nke isii, ya bụ site na ụzọ ahụ uche nke adịghị ahụ anya, uche dị omimi na amamihe dị omiimi. N’imatụ nke a, site na ahụ uche nke isi dị omimi.

Na foto dị n’elu, anyị na-ahụ anwanyị nke na-esiri ụyọkọ roses. Nke a ga- abụ ahụmahụ ebe ọ bụ na enwere isi ihe nke na-esi isi ụtọ nke roses ya bụ ụyọkọ roses. Na foto nke ọzọ, anyị na-ahụ anwanyị na anaghị esiri roses, na-eche banyere mmalite nke ụbọchị ọrụ ya. Na mberede na n’enweghị ihe kpatara ya, o nweta ezigbo isi ụtọ nke sandalwood. Na mbido ọ hapụrụ ya ebe ọ bụ na ọ hụghị ebe osi abịa ma na-aga n’ihu na eche maka ụọchị ọrụ ya. Otu ọ dị, isi ụtọ a soro ya ga na ebe ọrụ ya ma na-esogharị ya na ụtụtụ niile. Ọ jụọ ndị ọzọ ma ha ana enweta isi ụtọ a, ma onweghị onye na-enweta ya. Nke bụ ahụmahụ ime mmụọ. N’okwu a nwanyị ahụ n’eziokwu nwetara isi ụtọ na-apụta site na ụzọ adịghị ahụ anya ma na-enwe isi ụtọ site na ahụ uche nke isi dị omimi ya. Ike ighọta ma ọ bụ inweta ụzọ dị omimi site na uche nke ise dị omimi, uche dị omimi na amamihe dị omimi bụ nke amara dị ka uche nke isii onye ahụ.

3. Gịnị bụinweta uche nke isii site na ahụ uche ise dị omimi?

E mere ụwa site na Ụkpụrụ ihe na-eme ise Zụrụ oke (Panchatattva). Adịghị ahụ Ụkpụrụ a na-eme anya mana eji ya mee ihe niile ekere eke. Mgbe uche isii anyi bidoro rụba ọrọ, anyị ebido na-enweta Ụkpụrụ a na-eme na usoro, bido na nke nnukwu ruo na nke anaghi ahụ anya. Ya mere, anyị nwere ike ịhọta ha n’usoro nke Ụwa Zụrụ oke (Pruthvī), Mmiri (Āpa), Ọkụ (Tēj), Ikuku (Vāyu) na Ohere (Ākāsh) ihe ndị a site na uche ahụ anyị miri emi nke, ụtọ, ịhụ ọhụụ, imetu na ụda.

Tebulu nke na esonu ne-enye ihe atụ nke ime mmụọ nke dị mma na nke adịghị mma nke anyị nwere ike inweta site na uche nke isii, ya bụ, site na ụzọ nke uche ise dị omimi.

Ahụ adịghị ahụta nke uche isii Ihe nke zuru oke na-eme Ihe atụ nke ahụmahụime mmụọ yiri nke a
+ Ahụmahụ dị mma – Ahụmahụ adịghị mma

Isi

Ụwa Zụrụ oke

Na-enweta isi ụtọ nke sandalwood na-adịghị ebe ahụ.

Na-enweta isi nwa amịrị na okokoro ụlọ na enweghị ihe kpatara ya.

Ụtọ

Mmiri Zuru oke IỤtọ ụtọ n’ọnụ mgbeọdịghị ihe ụtọ ọbụla n’ọnụ Iweta ụtọ ilu n’ọnụ.

Ịhụ

Ọkụ Zụrụ oke

Ịhụ ọhụụ nke Chi ma ọ bụ na-enwe mmetụta ya.

Na-ahụ  onye mmụọ

Mmetu

Ikuku Zụrụ oke

Na-enwe mmetụta aka na isi mgbe ọdịghị onye ọbụla nọ nso.

N’ịbụ onye a na-awako n’abalị site na onye mmụọ(ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike dị njọ na ndị ọzọ)

Ụda

Ohere Zụrụ oke

Ịnu ụda mgbarịngba ma ọ bụ onye nhazi mgbe ọdịghị mgbarịmgba ma ọ bụ onye nhazi nọ nso

Na-anụ olu ndị ọzọ na-eyi egwu mgbe ọdịghị onye ọbụla nọ nso..

Mgbe mmadụ nwetara ihe site na ahụ uche dị omimi, imatụ, isi, ebe o si nw.ere ike ịbụ site na ike dị mma dị ka Chi ma ọ bụ ike adịghị mma dị ka mmụọ.

4. Kedu otu esi emepe uche nke isii?

Ụwa adịghị ahụ anya gbara anyị okirikiri. Otu ọ dị, anyị nweghị ike inweta ya. N’agbanyeghị na anyị enweghị ike inweta ya, ọ na-emetụta ndụ anyị n’ụzọ dị ukwuu. Iji nụ ihe na-eme n’ime ụwa a, anyị chọrọ ‘eriri nchọpụta ime mmụọ’(‘spiritual antenna’) ga-enyere anyị aka, ya bụ uche isii anyị chọrọ mkpọte. Uche isii anyị  na-eto mgbe anyị na-eme omume ime mmụọ. Jiri omume ime mmụọ na-eme mgbe nile dị ka ụkpụrụ isii bụ isi nke ime mmụọ, Anyị na-ebuni ọkwa ime mmụọ anyị, anyị nwe ike na-aghọta ma na-enweta ihe na-eme n’ụwa adịghị ahụ anya ebe ọdị ụkwụụ.

Gịnị bụ uche nke isii?
Uche na amamihe Ụwa: Dika ihe okike Chineke dị ka mmadụ, ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ nwere uche na amamihe, otu ahụ ka ọ dị ihe nile Chineke kere. Eluigwe na Ala nwere uche na amamihe nke nwere ezigbo ihe ọmụma nke ihe niile dị na Eluigwe na Ala. Enwere ike iche ya dị ka Uche na Amamihe Chineke. Ka mmadụ na-etowanye n’ime mmụọ ka uche na amamihe dị omimi onye ahụ na-ejikọta Uche na Amamihe nke Ụwa. Otu a ka enwere ike ịbanye na ihe ọmụma gbasara ihe niile Chineke kere

Nke a bụ otu dị ka igwe telivishọn na-enye ihe na-acha oji na ọcha anaghị ahụ nke ọma mgbe onweghị njikọ ya na eriri (antenna). Ọbụrụgodi na igwe telivishọn na-enweta mmgbama, igwe telivishọn enweghị ike ijide ha kama ọ dị njikọta na eriri (antenna). N’otu aka ahụ, ụwa dị omimi na ọnụnọ Chineke na-adị anyị gburugburu oge nile, mana anyị anaghị enweta ya kama anyị gbidoro na-eme omume ime mmụọ,nke ga-atugharị nyere anyị aka na uche nke isii anyị.

Biko gaa na ngalaba anyi na omume ime mmụọ nke ịzụlite uche isii ma ọ bụ ikike nghọta miri emi.

Mgbe ụfọdụ, anyị na-ahụ ndị nwere ike nghọta ụwa miri emi site mgbe ha dị obere ọ bụ ezie na ha emebeghị omume ime mmụọ ọ bụla. Ihe kpatara nke a bụ na-ha eruola ọkwa ime mmụọ dị mkpa site na omume ime mmụọ nke ha mere na ọmụmụ ha gara aga( ndụ gara aga). Ihe ọzọ kpatara nke a nwere ike ime bụ maka na mmụọ enwerego ha dị ka onye dibịa afa(amosu)(māntrik) gbido na nwata. N’okwu a, ọ bụ n’ezie uche isii nke onye aghụghọ ya ka ọ na-egosipụta.

5. Kedu njikọ dị n’etiti uche isii na ọkwa ime mmụọ?

Ogologo (nhazi) ụwa a ‘ma ama tunyere ụwa nke amaghị ama ma ọ bụ ụzọ anaghị ahụ anya bụ otu na-agụta ọnụ(enwghị ngụcha)

Ka ọkwa ime mmụọ anyị na-agbago agbago, ka anyị na-enwe ike ighọta nke ukwuu ihe nke ụwa anaghị ahụ anya site na ikike inweta ihe anaghị ahụ anya anyi, ya bụ, uche isii anyị. Tebulu n’esonu na-egosi njikọ dị uche isii anyị na ọkwa ime mmụọ anyị..

Ikike uche isii na ọkwa ime mmụọ

ọkwa ime mmụọ nke mmadụ
(na nnarị)
ụzọ na nnarị nke ọmụma enwetara site na
Uche ise dị omimi Uche dị omimi na Amamihe dị omimi
iri anọ% iri %  iri anọ %
iri ise% iri atọ% iri ise %
iri isii% iri asaa% iri  isii %
iri asaa% otu nnarị % iri asaa%
iri asatọ% otu nnarị % iri asatọ %
iri itenanị% otu nnarị % iri itenanị %
otu nnarị% otu nnarị % otu nnarị % (ọdịghị nkewa)

Site na tebulu a dị na elu, anyị nwere ike ịhụ na nke kachasị nke e nwere ike ịghọta site na uche ahụ dị omimi ka ana enweta n’ọkwa iri asaa% ọkwa ime mmụọ. ya mere, ka ọkwa ime mmụọ na-agbagokwu, onwezighị mgbago ọbụla na ịghọta dị omimi site na uche ise nke ahụ dị omimi. Otu ọ dị, uche dị omimi na amamihe dị omimi gara n’ihụ na-agbago n’ike n’ike na ịnu n’ime ihe nile dị na uche ụwa na amamihe ụwa ganye na onweta ọkwa ime mmụọ nnari%. Tebulu nke na- esonu na-egosi opekata mpe ọkwa nke ime mmụọ dị mkpa iji na-enweta nke ọbụla n’ime uche ise dị omimi ma ọ bụrụ na uche isii onye ahụ bụ n’eziokwu ọrụ nke ọkwa ime mmụọ. N’imatụ, Onye ahụ nwere ike  inweta uche dị omimi nke isi na ọkwa ime mmụọ nke iri anọ%.

Gịnị bụ uche nke isii?

Ebe ihe ogologo eserese a na-arụ dị ka nduzi iji kọwa mmekọrịta dị n’etiti ọkwa ime mmụọ na uche nke isii, anyị kwesịkwara ịhụ ihe ndị a:

  • Mgbe mmadụ na-enweta ahụmahụ ime mmụọ nke isi ihe ahụghị anya, ọ pụtaghị na ọ nwerugo ọkwa ime mmụọ nke iri anọ%. Ọtụtụ oge ọ bụghị, ọ bụ okwu ihe obere oge ma ọ bụ nkuni na-agafe agafe na ọkwa ime mmụọ ma ọ bụ ikike maka oke omume ime mmụọ dị ka ịkpọkụ Aha nke Chineke, ma ọ bụ ịbụ ndị enyi nsokọ nke ndị nsọ na ihe ndị ọzọ.
  • Enwere ike inwe ihe ndị ọzọ na-atụnye ahụmahụ ahụ. N’imatụ, Ọ bụrụ na onye mmụọ (mmụọ ọjọọ, ekwensu, ike na-adịghị mma na ndị ọzọ ga) chọrọ ka mmadụ nweta isi nwa amịrị na okirikiri ụlọ iji yee onye ahụ egwu, o nwere ike iji ike nke ime mmụọ ya wee mee nke a. Nke a na-eme na-agbanyeghị nrigo ọkwa ime mmụọ onye ahụ ọ chọrọ.
  • Ọpụtaghị na onye ọbụla nọ na ọkwa ime mmụọ iri anọ%  ga-enwtarịrị  isi ihe adịghị ahụ anya. Ọkwa ime mmụọ nke mmadụ bụ ọrụ ngbakọ ọnụ nke ọtụtụ agwa; uche isii bụ otu n’ime ha. Jee na edemede nke ọkwa ime mmụọ.
  • Ọpụtaghịkwa na ndị ahụ nwere ike inweta ruo nnarị% nke isi ihe nile adịghị ahụ anya a na-enweta ma ọ bụ na ha nwere ike inweta ya mgbe niile na mgbe ọbụla.
  • Ọpụtaghịkwa na onye nọ na ọkwa ime mmụọ nke iri anọ%  ma ọ bụ karịa ga-enwetarịrị isi ụtọ nke ahụghị ebe o si abịa. Mmadụ nwere ike iru ọkwa ndị nsọ (ya bụ iri asaa% ọkwa ime mmụọ) na-enwetanughị ihe ọbụla site na uche ise dị omimi. Otu ihe kpatara na ha enwenughọ udị ahụmahụ a nwere ike ịbụ na onye a na-enwebụ ụdị ahụmahụa na ndụ gara aga, ọ chọghịzị ha ugbu a.Ndị nsọ otu ọ dị, nwere uche isii nke gbasara uche na amamihe dị omimi.

I nwere ike ịhụ site na ogologo eserese na uche nke mmetụ adịghị ahụ na nke ụda bụ nanị na ọkwa ime mmụọ dị elu ka a na-enweta ha. Ihe kpatara nke a bụ na ha ka dịwanye omimi n’ime uche ise dị omimi.

6. Kedu  njikọ dị n’etiti uche isii (ESP) na ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị?

Ụmụ anyị, n’ozuzu ha, nwere nnukwu ike uche isii karịa ụmụ nwoke. Ikike nghọta Uche ngbakwunye(ESP) na-abata karịa na ụmụ anyị dị ka Chi si kee ha. O yikarịrị ka ụmụ anyị ka enwe mmetụta dị omimi karịa ụmụ nwoke. Otu n’ime ihe ndị na-akpata nke a bụ na ụmụ nwoke ka nwee ọgụgụ isi (amamihe) bịa nọdụ n’akụkụ ịmata ihe.

7. Ahụmahụ nke ime mmụọ ndị metụtara uche dị omimi na amamihe dị omimi

Mgbe ụfọdụ a na-enwe mmetụta dị ịtụnanya nke na ya abatarugo na ụlọ ya mgbe ọ hụrụ ụlọ amadịghị cha, mmetụta siri ike na ọdachi na-abịanụ, ma ọ bụ  na-enwe mmetụta ịhụnanya adịghị agwu agwu maka onye ihe ya anaghị amasi ya ma ọlị. Ndị a bụ ahụmahụ site na uche dị omimi. Anyị enweghị ike ịghọta ihe nọ n’azụ mmetụta ndị a. Mgbe ụfọdụ anyị na anụ maka ndị na enweta ozi site na ụzọ dị omimi, na ha na ndị nọ na ebe dị omimi na-akpa nkata. Ngalaba na-esonu ga-akọwa ihe omimi nke a n’uju.

7.1 Kedu ka mmadụ si enweta udị ozi a?

Ndị mmadụ na-enweta ọmụma site n’ụzọ dị omimi n’ozuzu ha na-enwta ya na ụzọ atọ:

  • Site na ikwe ka ihe adịghị ahụ anya were aka onye ahụ we dee ozi ha (amara dị ka edereede)
  • Site na ịhụ ọhụụ ebe ndị ahụ n’ezie na -ahụ okwu ndị ahụ ma ọ bụ amaokwu n’ihu ha
  • Site na echiche

N’ime usoro ndị dị n’elu, ịnata azịza na echiche ka dị omimi n’ime ụzọ atọ ndị a.

7.2 Kedu ihe bụ isi iyi nke ihe ọmụma nke uche isii na-enye ohere?

Ndị mmadụ na-enweta ihe ọmụma site n’ụzọ dị omimi na-enwta ya ọ bụghị site na:

  • Na akpaghị aka n’ihi ikike ha nwere iji banye n’ime uche na amamihe ihe niile nke ụwa, ma ọ bụ
  • Dị ka azịza nke ajuju Kpọmkwem nke ha juru ndị ahụ adịghị ahụ anya.Ha na-enwe ike ime nke a site na uche ha nke isii site na ụzọ nke  uche ha dị omimi na amamihe.

N’ọnọdụ abụọ ahụ, Onye ahụ na-aghọta ụzọ ahụ dị omimi, mana ọ bụ nanị mmadụ topụtagoro n’ime ihe gbasara ime mmụọ nwere ike ịghọta ma ihe ọmụma enwetara bụ site na ụzọ nke mbụ ma ọ bụ nke abụọ. N’ọtụtụ ọnọdụ onye ahụ na ndị dibịa afa(amosu) na-akparịta ụka site na akụkụ dị iche iche na ebe ahụ dị ka mpaghara Nether (Bhuvarlok) na mpaghara ọkụ mmụọ(Pātāl), ma nke anaghị adịkarịsị site na chi ma ọ bụ Chineke, ya bụ uche na ọmụma ihe niile.

Ụdị na ọkwa ma ọ bụ ọkwa nke ozi anatara dabere na ọkwa nke ime mmụọ nke onye na-anata ya.

Gịnị bụ uche nke isii?

Ozi sitere na isi ala:

Ogologo (nhazi) ụwa a ‘ma ama tunyere ụwa nke amaghị ama ma ọ bụ ụzọ anaghị ahụ anya bụ otu na-agụta ọnụ(enwghị ngụcha)

Ozi ndị enwetara site na ndị anaghị ahụ anya si na mpaghara dị ala, ya bụ, site na mpaghara Nether  ma ọbụ mpaghara ọkụ mmụọ, bu karịrị na udị ọdịdị nke ụwa na nke dị mkpa nanị maka akụkụ nke ụwa na nke na-adị nwa oge. Ịmatụ nke a ga-abụ inweta ozi maka ma onye a aga enwe dị/nwunye ma ọ bụ ga- enweta ọrụ. Kedu ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-emeri ntuli aka na Mba ọbụla ga- abụ imatụ ọzọ nke ụdị ọmụma enwetara site ndị anaghị ahụ anya nọ na ọkwa dị ala na ụzọ ime mmụọ.

Ozi ndị nke Nostradamus nwetara bụ imatụ nke ụdị ozi a. Nostradamus, n’onwe ya nọ na ọkwa ime mmụọ iri ise%, nweta ozi site na onye adịghị ahụ anya nọ na ọkwa ime mmụọ iri anọ%. Ọtụtụ na ndị na agba afa(ọhụụ) danyere na ụdị a na- inweta ọmụma.

Ahụ adịghị ahụ anya nọ na ọkwa ime mmụọ iri anọ nwere ike inweta ọmụma nke karịrị ya site na ndị adịghị ahụ anya aka ya na elu. Ọzọ, ndị adịghị ahụ anya nọ na otu ọkwa ma ọ bụ na ọkwa ka elu obere nwere ọmụma achọrọ, nwere ike inyefee ya. Nke dị ka onye ọrụ ụlọ na-arịọ ọmụma maka osise ụọ ma ọ bụ Carpentry site na onye ọzọ.

Ihe ọmụma nke sitere na isi ihe dị elu:

Eligwe na Ala niile nwere mpaghara iri na anọ ma ọ bụ mbara(lokas) ịdị adị, na-agunye mbara asaa dị mma na mbara asaa adighị mma. Ụwa naani bụ mbara nke dị a na ahụ anya ebe ndị ọzọ niile adịghị nhụta anya na ọdịdị ha. Eligwe bụ sọ otu n’ime mbara dị mma anyị nwere ike ịga mgbe anwụsịrị

Ihe ọmụma enwetara site na ndị anaghị ahụ anya si na mpaghara nke dị elu dị ka Maharlok (karịrị Eluigwe) n’elu, bụ nke ime mmụọ dị adị. Ihe ọmụma a na- enweta na aganihu na ịbụ mkpa nke ụwa nke na-adịgide adịgida n’ihe gbasara oge na narị afọ. Na-enweta ihe ọmụma Chineke site na uche zuru oke na amamihe zuru oke (ya bụ uche na amamihe agwa Chineke) bụ nke kachasi na ụdị. Dị ka egosiri na foto dị n’elu, Ọ bụ nanị ndị nsọ nwere ike inweta ihe ọmụma nke a. Ịmatụ nke a bụ ọmụma e nwetara dị na Nsọ Vēdās site n’aka ndị Isi nke oge ochie India.

Iji chọụta ihe bụ isi iyi nke ihe ọmụma ahụ ekpokọtara site na uche isii bụ, Onye ahụ ga-achọ ịnọ na ọkwa ime mmụọ dị elu ya bụ onye nsọnke iri itenani% ma ọ bụ karịa.

Maka ozi ndị ọzọ banyere mbara ahụ nile adịghị ahụ anya ma ọ bụ mpaghara nile biko gụọ ihe edemede ‘Ndụ’ mgbe a anwụsịrị – Kedu ihe na-eme mgbe anyị nwụsịrị?’.

7.3 Kedu usoro iji chọpụta ma ozi enwetara bụ site na uche isii ka ọ bụ site na uche echiche nke onye ahụ nke ọ machaghị na ọ na-eche?

O nwere ihe ole na ole nchịkọta nke na-atụ aro na a na- enweta ihe omuma site na isi iyi dị ndịpụta dị ka o megidere echiche nke onwe ya.

  • Mgbe ọdịnaya nke ihe ọmụma ahụ dị  ezigbo iche na ihe ọmụma nke onye na-ata ya. N’ịmatụ, o nwere onye na-achọ Chukwu nke jisi ike gụọ akwụkwọ sekọndrị ma na-enweta ihe osise nke igwe siri ike nghọta.
  • Ọtụtụ ihe ọmụma e nwetara bụ ihe ngosi ọzọ. Onye na-achọ ihe nke Spiritual Science Research Foundation (SSRF) na-anata ihe ọmụma nke Chineke site na ụzọ dị omimi ka mgbe ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa iri nke ahọ puku abụọ na atọ. Kwa ụbọchị ọ na-enweta ihe ọmụma karịa ibe akwụkwọ iri na ise – iri abụọ. A na-enyocha ma na-atụle ugbu a ihe ọmụma ime mmụọ maka ọ dị mma nke ụmụ mmadụ.

7.4 Kedu ihe ndị na-ekpebi onye ahụ na-enweta ihe ọmụma site na uche isii na amamihe dị omimi?

Enwere nchịkọta ihe ndị na-aga n’ime ikpebi ụdị  mmadụ na-enweta ihe ọmụma site na uche isii. Ọkwa ime mmụọ nke mmadụ bụ otu na isi ihe ndị ahụ na-eso na-ekpebi ụdị onye na-enweta ihe ọmụma si na omimi. E wezụga ọkwa ime mmụọ, ihe ndị na-ekpebi inweta ahụahụ ime mmụọ dị elu dị ka inweta ihe ọmụ bụ ndị:

  • Mkpali na agụụ siri ike nke onye ahụ
  • Mkpa maka ozi Chineke
  • Mkpebi na ngozi nke onye ndu(Guru) (onye ndụ na-edu ndu nke ime mmụọ  nọ karịrị ọkwa ime mụọ iri asaa%)
  • Akaraka nke mmadụ

O kwesiri imata na ọ bụrụ na mmadụ dị elu nke ime mmụọ nwere mmasị na inweta ihe ọmụma nke ọdịdị dị ala, dịka ọmụma atụ, nchegbu gbasara ọ bụla na-eme n’Ụwa kwa ụbọchị, ọ bụ ezie na o nwere ike inweta ihe ọmụma site na ndị anaghị ahụ anya nke ọkwa dị elu, ọ ga-enweta ihe ọmụma dị otu ahụ site na ndị ahụ ananghị ahụ anya di ala. N’ụzọ dị iche, ọ bụrụ na atụle onye ọkwa ime mmụọ dị ala, ịmatụ, iri ise% nwere nkpalite miri emi iji mụta ụkpụrụ dị elu nke ọka nmụta ime mmụọ, ọ ga-enweta ihe ọmụma site na ndị anaghị ahụ anya dị elu ma ọ bụ ndị nke si na mpaghara dị elu, ọkachasị ma ọ bụrụ na onye ndụ gọziri ya.

7.5 Uche isii, mmetụta siri ike na o nwere ihe na-achọ ime na oge na ohere

Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-enwe mmetụta na o nwere ihe na-achọ ime, ma ọ bụ enwe mmetụta n’ike banyere ihe ndị mere n’oge gara aga. Nke a nwere ike ime n’ụzọ abụọ:

  1. Nke mbu. Site na anụ ahụ dị omimi: Mmetụta na ihe na-achọ ime( ozi) ka e tinyere ha n’echeghị echiche ha site na anụ ahụ dị omimi. N’ọtụtụ ọnọdụ, anụ ahụ ndị a dị omimi ma ọ bụ ndị ọrụ bụ ndị mmụọ sin a mpaghara Nether ma ọ bụ mpaghara ọkụ mmụọ. Ahụ ndị a dị omimi na ọnọdụ ụfọdụ nwere ikike ihụ gafee oge. Ọ bụrụ na ha onwe ha enweghị ikike nke, ha ga-enweta ozi site na ndị mmụọ nke ọkwa dị elu dị ka ndị dibịa afa nwere ikike a.
  2. Nke abụọ. Inweta Uche na amamihe(ọgụgụ isi) zuru Ụwa ọnụ: Uche na Amamihe  zuru Ụwa ọnụ enwere ebe asaa. Dabere na ọkwa nke onye ahụ na-ebe uche isii ya dị, onye ahụ were ike ịbanye n’ime ebe dị ala ma ọ bụ ebe dị elu nke Uche na Amamihe zuru Ụwa ọnụ.

N’obere ka ọ bụrụ ọnọdụ niile nke mmetụta na ihe na-achọ ime(ịdọ aka na ntị maka ọdịnihu), echiche ihe ga-eme na (ozi e nwetara site na ebe dị anya) na ịhụ ọhụụ (ozi e nwetara site na oge dị anya), a na-enweta ozi a site na  anụ ahụ dị omimi anaghị enweta ya site na ikike nke onye ahụ ịbanye na Uche na Amamihe zuru Ụwa ọnụ. A na-akọwa ihe ọjọọ ndị anụ ahụ dị omimi nwere ike ịme na mpaghara na esote.

7.6 Kedu ihe bụ eziokwu nke ihe ọmụma a natara site na uche nke isii?

Mmadụ n’ozuzu na-enweta ihe ọmụma site na anụ ahụ dị omimi nke nọ na ọkwa nke ime mmụọ bụ otu dị ka nke onye ahụ, na izi ezi na ọkwa nke ihe ọmụma bụkwa otu. Iji ghọta echiche a, tulee nha nke nkịtị ruo narị%, nke enweghị ihe ọmụma bụ nkịtị%. Ihe ọmụma pekarịsịrị mpe nke amamihe ghọtara bụ otu% na nke ahụ dị site na amamihe zuru Ụwa ọnụ bụ otu narị%.

  • Onye nọ na ọkwa ime mmụọ iri anọ% n’ozuzu na-enweta ihe ọmụma site na anụ ahụ dị omimi nke ọkwa ime mmụọ ya na ya kwekọrọ ya bụ iri anọ%, otu ọdị izi ezi ya bụkwa iri anọ ma ọkwa ihe ọmụma bụkwa iri anọ.
  • Ganye na ọkwa ime mmụọ nke iri asaa%, ịnweta ihe ọmụma n’abụkarị site na Ndị mmụọ (mmụọ ọjọọ, ekwensu, ike na-adịghị mma, na ndị ọzọ ga) ya mere ihe na-esonyere ya oke nke ike ojii. Ndị na-amaghị ihe usoro nke nnata ihe ọmụma nwere ike ghara ịma banyere akụkụ a ma si na ya kwenye n’ụzọ doro anya na ihe ọmụma niile enwetara. Ọ bụrụ na e nwetara ihe ọmụma site na ndị anụ ahụ dị omimi, enwere ike siri ike na o nwere ike ịbụ na ezugh ezu n’akụkụ ma ọ bụ ha nile. Anụ ahụ ndị dị omimi mgbe niile na-enye ihe ọmụma zuru ezu na mgbido ka o wee nwe nkwenye. Ozigbo o nwetara nke a, ha aga-n’ihụ na-enye ozi ụdị dịgasị iche iche na-ezighị ezi ma ọ bụ na-eduhie eduhie. Ihe ọzọ dị mkpa mmadụ ga-atụle bụ na ihe ọmụma enwetara site na anụ ahụ ndị dị omimi na-agbanyekarị ike ojii. Nke a na-emetụta onye nabata ozi ahụ  n’ụzọ dị njọ n’ụzọ dị iche iche dị ka adịghị ike ahụ, adịghị ike echiche uche, na-eme ka amamihe kpuchie amamihe, na ndị ọzọ. Mana usoro a ji nwayọọ nwayọọ nke na-eme ka onye ahụ ghara ịma nke a ma ndị ezi na ụlọ ya na ndị enyi ya. Ọ bụrụ na usoro ihe ọmụma a na-aga n’ihụ ruo ọtụtụ oge, onye ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ na- aghọ onye na-enweghị uche aka ya nke nọ n’aka anụ ahụ dị omimi ahụ ka o na-eji ya na-mee ihe n’ụzọ dịgasị iche iche iji na-enwetakwuo mmasị nke ya bụ anụ ahụ dị omimi.
  • Mana agafee ọkwa ime mmụọ nke iri asaa%, A na-enweta ihe ọmụma site na anụ ahụ dị omimi dị mma dị ka ndị nsọ na ndị nduzi nọ na mpaghara ndị dị elu karịa Eluigwe, ma ọ bụ na-enwta ya site n’ụzọ nke Uche na Amamihe zuru Ụwa ọnụ, Onweghị ike ojii na-eso ihe ọmụma nke a.
  • Mgbe a gafere ọkwa ime mmụọ nke iri asaa%, mmadụ ebido na-enweta ihe ọmụma zuru oke site na Uche na Amamihe zuru Ụwa ọnụ.

Enwete ọtụtụ ọkwa iji ghọta akụkụ adịghị mma  nke ụzọ dị omimi dị ka ndị mmụọ (mmụọ ọjọọ, ekwensu, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga), inwe mmụọ ọjọọ na agha site na mmụọ, ugboro ugboro ihe ndị mmadụ nwere ike inweta bụ nanị ọnụ mmiri ice. Ọ bụ nanị na ọkwa ime mmụọ karịrị iri itenani% ka mmadụ nwere ike ịghọta ụdị ihe niile iche iche nke ụzọ dị omimi.

Biko jee na edemede maka n’ime ikike  iji ghọta mmemme anyị nke uche isii.

8. Kedu ihe na-efu site n’ejighị  uche isii anyị  na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi?

Ihe eji Uche nke isii na-eme bụ nanị maka ọganihu ime mmụọ iji dị ka Chineke, ejecha ọgwụ na uto ọkwa ime mmụọ. Ya bụ, kedu ihe na-efu site n’eji uche isii anyị  na-eme ihe maka uru nke ụwa? Site na ezigbo ihe nke ime mmụọ, a ne-ewere ya na ejighị ya eme ihe dị mma mgbe eji uche isii mee ihe ma e wezụga uto ime mmụọ. Okwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na ike uche na-eji ikike uche ya chọpụta ma mmadụ ana aga ilụ di ma ọ bụ nweta ọlụ, a na-ewe ya ka iji ya na-eme ihe adịghị mma n’akụkụ nke ime mmụọ.

Mgbe onye nwere ike uche ji uche isii na-eme ihe adịghị mma, Ka oge na-aga ihe abụọ na-eme:

  1. Ikike ha efunahụ ha. Nke a na-emekarị karịa n’oge afọ iri atọ.
  2. Ha na-abụrụ nchebi nyere ndị dibịa afa  nke ike ime mmụọ  ha dị elu. Ndị dibịa afa na mmalite na-enye ụfọdụ ezigbo ozi, iji nweta obi ike nke onye ahụ.Otu ọdị, n’ikpazu ha na-eduhie ha ma ndị ahụ na-edu. N’ọnọdụ dị otu a, ikike ike uche ha na-adị ruo ogologo oge dị ka o nwere ike n’eziokwu na ịdịwanye mma. Mana ike ikike uche a abụghị site na omume nke onye ahụ kama n’ihi nke onye dibịa afa nke na-edu ike uche. N’ọnọdụ a, onyinye uche isii adịghị ahụkarị nke mmadụ nwere ọ kara iji nweta ịdị ka Chineke abụrụ ihe lara na iyi n’obere ihe.