Usoro nkewa nke mmejọ
Contents
1. Nkewa mmejọ n’ụzọ buru ibu
N’isi okwu a, anyị tụlere etu anyị si kewa mmejọ n’ụzọ buru ibu. Enwere ike ikee ha n’omume na-adịghị mma na mmeghachi na-adịghị mma yana ngwakọta nke omume na mmeghachi omume adịghị mma. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ole na ole n’akụkụ nkewa ọbụla nke mmejọ.
1.1 Omume adịghị mma
Nke a bụ ebe n’ihi ntụpọ omume ndị mmadụ, anyị na-eme ihe adịghị mma. Ihe ndị a bụ ụfọdụ ihe atụ nke omume adịghị mma.(ezighi ezi) :
- John akpachapụghị anya debe ihe ya n’ọnọdụ ziri ezi ma n’ihi ya dofụo ederede ya .
- Sheela na-aghọ aghụghọ n’ule ya.
- Fernado na-kụ nwunye ya ihe mgbe ọ ṅụfere mmanya oke lọta site na ụlọ mmanya.
- Marco na-aṅụ mmanya na-anya ụgbọ ala ga kụtuo onye ji ukwu aga.
- Shashank na-egbu oge na-agba egwuriegwu vidio mgbe o kwesịrị ịmụ akwụkwọ maka ule ya.
- Julian ji Adrian eme ihe ọchị iji wetụo ya ala ka e wee ahụta ya onwe ya ka onye ọma n’etiti ndị enyị ha.
- Chan nwere mmetụta ụme ngwụ iji sachaa efere dị n’ime ebe a na-asacha ihe
1.2 Mmeghachi adịghị mma
Nke a bụ ebe anyị na-emeghachi omume adịghị mma gbasara ihe omume, ọnọdụ ma ọ bụ mmadụ.
- Mgbe ịkwụ n’ahịrị ịnata ikike ilele onyonyo anaghị aga ọsọ ọsọ Selma enweghị ndidi ma na-enwe ahụ mgbakasi.
- Mgbe di ya enyeghị ya nsọpụrụ, Xiu Mei nwere nnukwu mmetụta, anya mmịrị jụrụ ya anya.
- Mgbe nna Tony enyeghị ya ego aka ịkpa ọzọ, o were nnukwu iwe..
- Mgbe Samantha na-eje ime ihe ngosi na ọgbakọ ụbọchị ahụ niile tupu ihe ngosi ahụ afọ na-alọ ya mmịrị, ụjọ ji ya.
- Mgbe Ali dara ajụjụ ọnụ maka ọlụ, o bidoro ịnwe obi nkoropu banyere ọdịnihu.
- Mgbe Sunita nụrụ na nwa ezigbo enyị ya mere ọfụma n’ule ya, o nwere ekworo dịka nwa nke ya mekwara ọfụma na otu ule ahụ.
1.3 Omume ezighi ezi na mmeghachi (ngwakọta)
Ebe a anyị na-eleba anya na ngwakọta nke omume ezighi ezi na mmeghachi na otu ọnọdụ:
- Mgbe onye ọkwọ ụgbọ ala gbabara n’ihu Ronaldo n’etiti okporo ụzọ ama, Ronaldo tigara ya mkpu n’iwe.
- Mgbe enyị nwanyị Antonio jụrụ ya obi dara ya mba, ọ gara n’ụlọ mmanya ṅụfee mmanya oke.
- Mgbe Vladimir chọpụtara na onye ọkwọ ụgbọ ala ghọrịrị ya, o bidoro kparịa ma kụọ onye ọkwọ ụgbọ ala ihe.
- Ka ọ na-arụ dị ka nwaodịbo na ezi na ụlọ onye ọgaranya, Maria hụrụ ego dị na okirikiri ahụ. Anya ukwuu jidere ya, ka o legharịrị anya hụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o tịnyere ego ahụ na akpa ya.
- Mgbe a gwara Heinrich na onye na-ere nrị enweghị ike ịnye ya nrị ọchọrọ, o were iwe ma kpọrịa ndị mmadụ.
- Mgbe nna Amara bara ya mba, o nwere mmeghachi ma kpọchị bịdo onwe ya n’ime ụlọ ya ụbọchị ahụ niile.
2. Na nchịkọta
- Ọ dị mkpa ima mgbe e mere mmejọ na ịmata ma ọ bụ omume, mmeghachi ka ọ bụ ngwakọta ha abụọ.
- Site na idetụ mmejọ e mere, ọ na-enye aka n’usoro nke ịmata onwe onye.