Mmetụta Ime Mmụọ nke Ọnwa zuru ezu na Ọnwa ọhụrụ
Contents
- Mmetụta Ime Mmụọ nke Ọnwa zuru ezu na Ọnwa ọhụrụ
- 1. Okwu Mmalite.
- 2. Mmetụta nke ọnwa na-eme dị omimi (anaghị ahụ anya)
- 3. Mmetụta dabere na ọmụmụ ọkụ (ihe) ma ọ bụ ihụ nke ọnwa
- 4. Mmetụta dabere na ọdịdọ ndọtụlata nke ọnwa
- 5. Ihe mmụba mmeụta nke ọnwa zuru ezu na ọnwa ọhụụ na-eweta.
- 6. Gịnị mere na akụkọ ihe mere ọdịnso a enweghị ike ịchọpụta ihe-ngosi nke mmetụta nke ọnwa na omume ụmụ mmadụ?
- 7. Kedu ihe anyị nwere ike ime iji chekwaba onwe anyị site na mmetụta ọjọọ ọ bụla?
1. Okwu Mmalite.
Kamgbe iri afọ ole na ole enwere ọtụtụ akụkọ ndị ọkachamara (sayensị) maka na megide mmetụta nke ọnwa na omume ụmụ mmadụ. Akụkọ ndị a kọwara arụmụ ọrụ uche dị elu, mmụba na-ije ụlọ ọgwụ nke ọha ma ọ ngalaba mberede na-ahụ maka uche na ndị mmadụ na-eme mkpesa banyere ọkwa dị elu nke nsogbu anụ ahụ na nke uche.
Ndị otu Sayensị na-enyocha Ime Mmụọ (SSRF) nyochara mmetụta nke ọnwa na omume ụmụ mmadụ ejiri usoro nyocha ime mmụọ mee. Na nnyocha ime mmụọ nke anyị mere ejiri uche isii ahụ iji ghọta mmetụta nke ọnwa na omume ụmụ mmadụ, azịza nke a na-egbughị oge bụ ee, ọ na-enwe mmetụta. Ihe ndị a na-esonụ bụ ụdị dị iche iche banyere otu ọnwa si emetụta ndụ anyị.
2. Mmetụta nke ọnwa na-eme dị omimi (anaghị ahụ anya)
Ihe niile gụnyekwuo kpakpando, mbara ala na ihe nnyocha ndị ọzọ dị na igwe tinyere agwa ha dị nnukwu (ana ahụ anya) na-ewepụta ọgịga dị omimi (anaghị ahụ anya). Agwa ndị a ahụrụ anya na ọgịga ndị a dị omimi na-emetụta anyị n’ọtụtụ ụzọ dịgasị iche iche na ọkwa anụ ahụ na nke dị omimi.
Ọgịga na apụta site na ọnwa na- emetụta ọgịga nke ụbụrụ ahụ, ya bụ uche nke ụmụ mmadụ. Site n’uche, ihe anyị na-ekwu maka ya bụ echiche anyị, mmetụta uche na ọchịchọ. Uche nwere uche nke ọ mara na uche nke ọ na-amachaghị. N’ime uche nke ọ na-amachaghị anyị nwere ọtụtụ echiche nke ekpụchịdoro na-ekpebi isi ọdịdị anyị na agwa anyị. Otu ọ dị anyị enweghị ọmụma nke uche ma ọ bụ echiche ihe ndị dị n’ime uche anyị anyị na-amachaghị. Echiche ndị a ka enwekọtara na ọtụtụ oge ndụ.
Echiche ndị a n’ime uche anyị bụ ihe na-akpalite echiche niile na omume niile na-eso ya. Ma echiche na uche nwere ọgịga dị omimi nke onwe ha.
Jee na edemede nke, ‘Kedu ka echiche dị n’uche anyị si eme ka anyị na-eme’.
Ọgịga nke ọnwa ji ntakịrị ihe karịa omimi (adịghị nhụta) nke ọgịga dị omimi nke uche anyị mana ọ dị ntakịrị n’omimi karịa ọgịga nke echiche dị na uche anyị. Ọgịga nke ọnwa nwere ikikere iji mee ọgịga uche sitere na echiche dị na uche amachaghị iji wepụta ya na uche amara. Ka ọ batara na uche amara anyị amalite ịmata ha. Ya mere mmadụ ji enwe nkpalite site na echiche bukarịrị n’ime uche onye ahụ. Anyị kọwara nke a n’uju na ngalaba na-abịanụ.
N’otu aka ahụ ọnwa na-emetụtakwa uche ụmụ anụmanụ. Ọtu ọ dị dịka uche amachaghị nke ụmụ anụmanụ nwere echiche naanị nke eji enwe isi ọchịchọ dị ka agụụ, mmekọrịta nwoke na nwanyị, ụra na ndị ọzọ ga, oke echiche na-emetụta naanị isi ihe ọchịchọ ndị a.
3. Mmetụta dabere na ọmụmụ ọkụ (ihe) ma ọ bụ ihụ nke ọnwa
Na ụbọchị ọnwa ọhụụ, akụkụ enweghị ihe, ya bụ akụkụ ọnwa gbara ọchịchị chere ihụ n’Ụwa. Ọchịchị na-ewepụta ọgịga nwekarịrị Raja-Tama. N’ihi ya atule mgbe akụkụ nke nwere ihe na-eche ihụ n’Ụwa, a na-enwekarị nzipu ọgịga dị omimi nke isi Raja-Tama n’Ụwa
Jee na edemede nke Sattva, Raja na Tama, isi ihe atọ dị omimi.
N’ụzọ ọzọ, n’ụbọchị ọnwa zuru ezu enwere mbelata na Raja-Tama n’ihi mmụba ihe. Otu ọ dị n’ụbọchị ọnwa zuru ezu dịka ọgịga ọnwa ka dị ire, a na-ahụ oke ịrụ ọrụ nke uche dị ka a kọwara n’elu na ntusi aka nke abụọ. Dabere n’ụdị echiche si na uche amachaghị nke na-arụ ọrụ, oke ịrụ ọrụ nwere ike ịbụ site na oke echiche ihe ọbụla ruo oke ịrụ ọrụ echiche uche gbasara otu ihe.
N’ịmatụ, onye bụ onye ode akwụkwọ nke tinyere uche ya na ọtụtụ akwụkwọ nke ọ na-ede nwekarịrị ike inwe oke echiche ịrụ ọrụ gbasara akwụkwọ ahụ na imepụta etu ọ ga-esi dee ya. Ụdị echiche ndị a ga-apụta site na akụkụ ọgụgụ isi nke onyinye. Ya mere o nwere ike chọpụta na o nwere ike ide ọtụtụ ihe n’ụbọchị ọnwa zuru ezu.
Otu ọ dị maka ọtụtụ ndị mmadụ echiche ahụ na-abụ nke ihe ọbụla. Ọ bụrụ na enwere ọnụ ọgụgụ nke agwa adịghị mma dịka iwe, anyaukwuu, na ndị ọzọ, mgbe ahụ ha nwekwara ike igosịpụta ma nọchie echiche anyị na oge a. N’ịmatụ onye na-aṅu oke mmanya ga-enwe echiche karịa banyere mkpa ọ dị maka ịṅụ mmanya n’ụbọchị ahụ.
O nwekwara ike ikpọte echiche maka ime mmụọ nke dị n’ime uche amachaghị nke ime mmụọ mmadụ site na enyemaka nke oke echiche uche ịrụ ọrụ na mmụba omume ime mmụọ n’ụbọchị ọnwa zuru ezu.
4. Mmetụta dabere na ọdịdọ ndọtụlata nke ọnwa
Mgbe ọnwa zuru ezu ma ọ bụ ọhụụ, ọdịdọ ndọtụlata nke ọnwa na anyanwụ na-agbakọta ọnụ. Ọnwa na-adọ Ụwa n’ụbọchị ndị ọzọ kwa, mana ọ dịghị ike ka n’ụbọchị nke ọnwa zuru ezu na ọnwa ọhụụ.
Asị na anyị ga-eku ume nzida, ikụkụ jụrụ ọnụ anyị ga-adị ụzọ atọ karịa nke anyị kụrụ na-etu esi eku ume. Ụgbu a ka anyị kọwa ihe nke a pụtara na ọnwa ya na ọdịdọ ya n’Ụwa. Mgbe ọnwa zuru ezu na ụbọchị ọnwa ọhụụ akụkụ ọnwa nile na-adọ Ụwa na mmetụta ya na ikụ ume nzida nke ọnwa dị ka akọwara na mbu. Anyị chọpụtara na okirikiri ọnwa na-adọrọ okịrịkịrị gbụrụgbụrụ elu ụzọ atọ nke ya na ya ha site n’Ụwa.
N’oge Ọnwa zuru ezu na ụbọchị ọnwa ọhụụ Ụkpụrụ ihe ndị zuru oke (Panchatattva) n’Ụwa dị ka Ụwa zuru oke (Pruthvī), Mmịrị zuru oke (Āpa) na ikuku zuru oke (Vāyu) na-adọkwuru Ọnwa. Nke a na-emepụta n’ụzọ dị omimi ụdị eriri ụdọ dị elu sịrị ike.
N’usoro a n’ọkwa ana-ahụ anya mgbe adọrọ mmịrị na-ejekwuru ọnwa, ka ma ọ ga-abụ mmịrị, mmịrị n’ụdị ikụkụ mmanụ (water vapour) na abịa n’elu mmịrị ma banye na erịrị ụdọ siri ike dị elu dị omimi. Ebe ike adịghị mma bụkarịrị n’ụdị ikụkụ mmanụ a na-adọkpụrụ ha banye na erịrị ụdọ sịrị ike dị elu dị omimi. Ebe a ha na-agbakọta ọnụ ma nwekwuo ike na ọnụ ọgụ site n’onwe ha. Ha enwe ike wakpo ụmụ mmadụ n’ụzọ dị ukwuu n’ụbọchị ndi ahụ. Mmetụta nke a bụ mwakpo nke ndị mmụọ n’ụmụ mmadụ ma n’ọkwa nke anụ ahụ ma na ọkwa nke uche nwere ike ruo ma gafee ụzọ atọ karịa.
N’ebe obibi ndị na-achọnụ (ashrams) nke ndị otu nnyocha sayensị Ime mmụọ (SSRF) n’ụwa gburugburu, mmụba na ike adịghị mma na ike ịdọrọ adịghị mma dị omimi ka ana-ahụ n’ụbọchị ọnwa zuru ezu na ụbọchị ọnwa ọhụụ. Nke a na-amalite ụbọchị abụọ tupu ọnwa ezuo ma ọ bụ ọnwa ọhụụ ma gwu ụbọchị abụọ ha gachara.
5. Ihe mmụba mmeụta nke ọnwa zuru ezu na ọnwa ọhụụ na-eweta.
N’ụbọchị ọnwa ọhụụ, ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma na ndị ọzọ ga) na-agha Raja-Tama, ndị mmadụ na-enwe ọgbakọ ịchụ aja nzizo na ndị mmadụ bụkarịrị rājasik na tāmasik na-enwe oke mmetụta ma na-enweta ike ojii maka ịrụ ọrụ Raja-Tama. Ebe ọ bụ ezi ụbọchị maka omume ndị adịghị mma, a na-ewe ya ka ụbọchị adịghị mma maka emume ọ bụla dị mma. Dịka Raja-Tama sitere na ọnwa na-emetụta uche, omume nke Raja-Tama dị ka ịgbafuu, ịgbu onwe ya ma ọ bụ ndị mmụọ inwere onye ahụ na-adị karị elu na ọnwa ọhụụ. Ọkachasị na oge abalị, mgbe nke ọzọ nwere ike na ọdịdị ya ịsachapụ ihe ọjọ site na Ụkpụrụ zuru oke nke Ọkụ (Tējtattva) sitere na Anyanwụ adịghị, abalị ọnwa ọhụụ na-abụ ndapụta ọla edo nye ndị mmụọ iji nye ndị mmadụ nsogbu. Ndị mmụọ na-ewe ịrị elu nke Raja-Tama ka enyemaka iji kpokọ ike ojii nke eji na-akwado omume dị ka ọdachị na-emere onwe ha ma ọ bụ omume nke ga-eduga na Agha Ụwa nke atọ.
N’abalị ọnwa zuru ezu, ka akụkụ ihe nke ọnwa chere ihu n’Ụwa, ntakịrị isi Raja-Tama dị omimi bụ ihe a na-ezipu n’abalị a ma atule ya n’abalị ndị ọzọ. N’ihi ya n’abalị a ntakịrị ike Raja-Tama dịrị ndị mmụọ, ndị mmadụ bụ Raja-Tama karịa ma ọ bụ ndị na-achụ aja nzizo. Otu ọ dị, ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma na ndị ọzọ ga) na-ewe enyeaka nke mmetụta nke ọdịdọ ndọtụlata nke ụbọchị ọnwa zuru ezu na-eme ka nsogbu dị elu.
Nnyocha ime mmụọ gara n’ihu na-egozi na-enwere ntakịrị ihe dị iche n’etiti mmetụta nke ọnwa ọhụụ na ọnwa zuru ezu na mmadụ. Nkpokọta ọnụ mmetụta nsogbu nke ọnwa na mmadụ karịrị n’ọnwa ọhụụ karịa na ọnwa zuru ezu. Mmetụta ọjọọ nke ọnwa zuru ezu karịrị na anụ ahụ ma ọ bụ ahụ ahụrụ anya (sthūladēha) ebe nke ọnwa ọhụụ karịrị na uche. Mmetụta nke ọnwa zuru ezu ka dị nchọpụta ebe nke ọnwa ọhụụ ka adịghị nchọpụta (aghụghọ). Ebe mmetụta ọnwa ọhụụ anaghị egosi na onye ahụ, ọ ka dị njọ. Nke a bụ n’ihi na ọ maghị na o nwere nsogbu, onweghị ihe ọ bụla ọ na- me iji merịe ya.
N’etịtị ọnwa ọhụụ na ọnwa zuru ezu mmetụta nke ọnwa ọhụụ ka anyị mara ntakịrị. Otu ọ dị mmetụta adịghị mma karịrị na ọnwa ọhụụ. Ihe kpatara nke a bụ na ụbọchị ọnwa ọhụụ mmetụta ya na mmadụ karịrị n’ọkwa dị aghụghọ na mgbagha nke ọnwa zuru ezu ebe onye ahụ mara maka mmụba n’echiche.
Ndị na-achọnụ na-eme nnukwu omume ime mmụọ n’usoro isi ụkpụrụ isii nke omume ime mmụọ bụ sāttvik na isi ọdịdị ha. N’ihi ya ha na-enwekarị mmetụta nke mgbanwe na Raja-Tama dị na ugburugburu ma atule ya na onye nkịtị bụkarịrị n’onwe ya Raja-Tama. Ihe dị mma bụ na ndị na-achọ Chineke ka enwe mbanye na nchekwaba nke Chineke maka ike adịghị mma. Jee n’edemede ‘Ole otu ọkwa ime mmụọ si na-enye mkpụchị nchekwaba banyere ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma na ndị ọzọ ga)?’
6. Gịnị mere na akụkọ ihe mere ọdịnso a enweghị ike ịchọpụta ihe-ngosi nke mmetụta nke ọnwa na omume ụmụ mmadụ?
Ọtụtụ ihe ọgụgụ maka ọgwụ na uche na oge mbu ka edere debe mmetụta nke ọnwa na omume ụmụ mmadụ. Mana ihe ọgụgụ ndị emere na arọ nso nso ewepụtaghị ihe gbasara mmetụta nke a. Ihe kpatara nke a bụ na iri arọ gara aga enwela mmụba atụghị anya na mkpokọta ọnụ Raja-Tama dị n’ụwa. Nkarị Raja-Tama nke a nwere isi nkwado ya site na ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma na ndị ọzọ ga).
Jee na edemede nke Agha dị n’etiti ọma na ọjọọ.
Nkpokọta ọnụ mmụba akụkụ Raja-Tama a nwere mmetụta gazụrụ akụkụ ụwa niile. Nsogbu ndị a gụnyere mmụba isi mgbaka n’ọkwa otu onye ruo na mmụba ọgụ na ezi na ụlọ ruo iyi egwu ruo ọdachị na-emere onwe ha. N’ihi mkpokọta ọnụ mmụba ndị a niile na omume ọjọọ na-eme n’ime ọnwa ahụ niile, mgbakwunye mmetụta nke ọnwa ọhụụ na ọnwa zuru ezu nke na-eme ugbu a na-agafe nnukwu ma ndị nmụta ọnụ ọgụgụ amaghị.
7. Kedu ihe anyị nwere ike ime iji chekwaba onwe anyị site na mmetụta ọjọọ ọ bụla?
Ka mmetụta ọjọọ nke ọnwa ọhụụ na ọnwa zuru ezu bụ n’ihi ihe gbasara ime mmụọ, naanị usoro ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ omume ime mmụọ nwere ike inye aka na-inye nchekwaba.
N’ọkwa ụwa, ọ ka mma ighara ime mkpebi dị mkpa ma ọ bụ igote ihe-ire ihe na ụbọchị ndị a dị ka ndị mmụọ nwere ike inye mmetụta site n’usoro ndị a. Kwalite ogo na ịdị mma nke omume ime mmụọ bido n’ụbọchị abụọ tupu ma mee ya ruo ụbọchị abụọ gafee ụbọchị ọnwa zuru ezu na ụbọchị ọnwa ọhụụ. Ọ nakwa aba uru ịkpọba Aha nke Chineke dị ka nkwenye na mkpọkụ nchekwaba ime mmụọ nke Shrī Gurudev Datta.
N’oge ihe ọnwa na-epelata mpe, ya bụ oge nọ n’etiti ọnwa zuru ezu na ụbọchị ọnwa ọhụụ, dị ka nha nke ọnwa na-epewanye mpe, isi Raja-Tama dị omimi ọgịga na-apụta na ya na-abawanye na-ịdị elu. Nke a bụ maka na akụkụ ọnwa gbara ọchịchị na-ebụwanye ibụ. N’ihi ya iji chekwaba onwe onye site na mmetụta ọjọọ nke mbuli elu Raja-Tama, ọ dị mkpa na anyị ga-akwalite omume ime mmụọ anyị n’oge ahụ.
N’oge ọnwa n’eti ọfụma, anyị ga na-agbalị opekata mpe iji debe nkwalite mgbalị anyị tinyere na, n’ụbọchị mbịdo. Nke a dị otu a ka anyị nwe ike ọzọ imenwo mgbalị anyị etinyere na omume ime mmụọ mgbe ihe ọnwa ga ebịdo ọzọ pelatawa mpe.