Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?

Ihe omuma

N’isiokwu a anyị na-enye nkọwa nke otu ekpere si arụ ọrụ na otu esi ekpe ekpere. Enwere ụdị ekpere abụọ – maka uru nke ụwa na maka uto nke ime mmụọ. N’ihi ya, a na- enweta azịza ekpere site na ụdị dị iche iche nke Chineke. Nchọpụta ime mmụọ gosiri na ma ike adịghị mma nwere ike ịza ekpere, nyere nsogbu anyị! ọkwa ime mmụọ nke mmadụ bụ otu ihe kachasị mkpa iji hụ na a zara ekpere onye ahụ. Ikpe ekpere maka udo nke ụwa, ọ bụ ezie echiche dị mma, o yikarịrị ka a gaghị aza ya n’ihi enweghị ike ime mmụọ nke ndị na-ekpe ekpere. N’ụzọ doro anya, ndị nwere ike ịmalite ịgbanwe ihe site na otu ekpere ha bụ ndị nsọ, ma ha na-ahụ ihe efu nke ikpe ekpere dị ka ha nọ na-eso nkwekọrịta nke n’uche Chineke ma ghara ịhụ na ọ dị iche na uche nke aka ha. N’ịkpeazụ, ọnọdụ a na-anọ mgbe ekpere na-emekwa ka a zaa ekpere.

1. Okwu mmalite nke usoro ekpere

Mgbe a nọ n’ọnọdụ ndị siri ike ma ọ bụ nke a pụghị imeri kwa ụbọchị na ndụ, dị ka ihe dị mkpa ifu, ọrịa a na-apụghị ngwọta, nnukwu nsogbu ego, n’ihe ndị ọzọ, ndị mmadụ na-ekpere Chineke ma ọ bụ ụdị ya, nke amara dị ka chi. Ndị a bụ ekpere na-atụ anya ihe onwunwe ma ọ bụ ihe nke ụwa.

Ndị na-achọ Chineke, ndị isi nlekwasị anya na ndụ ha bụ uto nke ime mmụọ, na-ekpekwa ekpere mgbe nile nye Chineke ọ bụghị nanị n’ọnọdụ ndị tara akpụ kama ọbụkwasị n’ọnọdụ nke kwa ụbọchị. Ekpere ndị a, otu ọ dị, abụghị maka ịtụ anya ihe nke ụwa kama ọ bụ maka uto nke ime mmụọ ha ma na-ekwu na ọ bụ akụkụ omume ime mmụọ ha.

Isiokwu a na-akọwa usoro nke esi aza ụdị ekpere nke ọbụla.

Iji ghọta isiokwu a nke ọma biko gụọ:

  • Nkọwa nke ekpere
  • Kedu ihe dị iche n’etiti ekpere nwere atụmanya na nke enweghị atụmanya?

Ọ dị mkpa ịmata na mgbe enwere nsogbu ọbụla ma ọ bụ ihe isi ike na ndụ, isi ihe kpatara ya nwere ike ịbụ anụ ahụ, uche ma ọ bụ mmụọ n’ọdịdị. Nnyocha nke SSRF mere gosiri na ruo iri asatọ%  nke nsogbu na ndụ nwere ihe mgbọrọgwụ ha na mpaghara ime mmụọ. Akaraka na ndị nna nna ochie ha bu ihe abụọ dị oke mkpa n’ihe na-akpata nsogbu na ndụ na mpaghara ime mmụọ.

2. Kedu etu esi aza ekpere? Gịnị bụ usoro?

2.1 Onye na-aza ekpere anyị?

  • Ihe osise a na-egosi onye na-aza ekpere anyị dabere na ụdị ekpere. N’ozuzu, ekpere dị iche dị ka ọkwa ime mmụọ nke onye ahụ. N’ịmatụ, onye nke nọ n’ọkwa ime mmụọ iri atọ% ga na- ekpekarị maka ihe nke ụwa. Onye nke nọ n’ọkwa ime mmụọ iri ise% ga na- ekpekarị maka uto ime mmụọ. N’ihi ya, ike dị iche iche anaghị ahụ anya nọ na Eluigwe na Ala na-aza ekpere. Ihe na-atụ na anya bụ na ma ike na-adịghị mma na-aza ekpere, ọ bụghị ebe a na-achọ imenye egwu  bụrụ iji kwere mmadụ nọ n’okpuru nduzi ha ọnya site na inye ha ihe ha chọrọ na mmalite. N’ịmatụ, dị ka egosiri na ihe osise na-esonu, onye na-ekpe ekpere ka onye ọzọ nwụọ ga-enweta enyemaka site na ndị ọjọọ nke sitere na mpaghara anọ nke ọkụ mmụọ(Pātāl). Ekpere maka uru ụwa n’ozuzu na-enweta ọsịsa site na ụmụ obere chi ma ọ bụ ike dị mma dị ala. Ekpere maka uto nke ime mmụọ na-enweta ọsịsa site na chi dị elu na ike dị mma dị elu.
Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?
  • Mgbe anyị na-eme ekpere nwere atụmanya nye Chineke ma ọ bụ otu chi, dị ka ịyọ maka ọrụ ma ọ bụ ịgbake n’ọrịa, ekpere anyị dị ka e kwuburu, n’enwe ọsịsa site na ụmụ chi dị ala ma ọ bụ ike dị mma dị ala. Ka anyị were ịmatụ nke onye yọrọ ezigbo ayịyọ maka inweta ọrụ. Ọ bụrụ na ọ dị n’akaraka mmadụ na ọ ga-anọ na-enweghị ọrụ ruo arọ ise, mgbe ahụ ike dị mma dị ala ma ọ bụ chi ndị dị ala nwere ike ịza ekpere site na ịkwapụ ga oge enweghị ọrụ arọ ise kwaruo ya otu ebe na ndụ onye ahụ n’ịkpeasụ. Ya mere, onye ahụ ka ga-agafekwarị  oge enweghị  ọrụ.(Nke bụ maka na n’ihi na agbanyeghị ihe ọ bụla, onye ahụ ga-enwetarịrị akaraka ya, ọ bụ nanị site na omume ime mmụọ ya ka ọ ga-emeri )
  • Oge ụfọdụ chi ndị dị elu na-enwekwa aka n’ọnọdụ ụwa nke onye na-achọnụ  ma ọ bụrụ ọ na-ebutere ya ngbochi na uto nke ime mmụọ ya.

2.2 Kedu ka esi aza ekpere?

  • Mgbe mmadụ na-ekpe ekpere, ọ na- echeta Chineke nke ukwuu ma na-enwe mkparịta ụka chiri anya ya na ya banyere ihe ndị dị ya nso n’obi. N’iwu nke imeghari ihe, Chineke na-enwekwa mmetụta nso an-ebe ọ nọ.
  • Ekpere nwere ikike ime ka ụkpụrụ chi (agwa Chineke) malite ịrụ ọrụ n’Eluigwe na Ala. A na-enwe ihe ọgịga dịkarịsịrị omimi mgbe mmadu na-ekele ekele tinyere ekpere ya. Ihe ọgịga ndị a nwere ikike na-abụghị naanị iji na-arụ ọrụ kama na-emetụtakwa chi; n’ihi ya ụkpụrụ chi n’ebido ọrụ ngwa ngwa. Mbido ọrụ nke ụkpụrụ chi a (agwa nke Chineke) na-eweta mmezu nke ekpere. Chi ndị a na-eweta mmezu nke ekpere site na ike nke mkpebi.  Jee na edemede nke onye bụ chi?

    וֹmatụ nke ekpere na-eso inye ekele:

    • Dinwenum  biko ka m nweta ọrụ a, achọ siri m ya ike. Dinwenum biko nabata ekele m maka inye m echiche nke ikpe ekpere.
    • Dinwenum, ka m mee ihe nile n’ime ubochi taa dịka ihe omume ime mmụọ m. Dinwenum, ana m enye gi ekele na Ụkwụ nsọ gị maka inye m echiche ahụ na maka ime ekpere a site na m.
  • Ekpere na-adọta ikikere nke Chineke dị omimi n’ebe onye ahụ nọ ma n’ihi nke a, Raja-Tama nọ onye ahụ okirikiri emebie. Ya mere, gburugburu ebe obibi ahụ adị ka ihe dị nsọ karịa sāttvik. Ka isi omimi Sattva ihe dị nsọ na gburugburu ebe obibi na abawanye, echiche onye ahụ na-ebenata, ha a na-adịwanye sattvik nsọ. Nke bụ maka na gburugburu ụwa na-emetụta uche.
  • Ihe mkpuchi (kosh) kachasị mma, mkpuchi anaghị ahụ anya nke akụkụ nke anụ ahụ dị omimi ma dịkarịa ike. Ya mere ike nke ahụ, uche ahụ, ahụ amamihe na anụ ahụ dị elu dị omimi, nke ọ bụla nwere ihe mkpuchi nke kewara ya ma gba ya gburugburu.

    Maka ịmatakwa ihe ọzọ gbasara ike na uche nke ahụ, jee na “Gịnị ka eji mee anyị?

  • Ekpere na-abawanye ịdị asọ Sattva na akụkụ mkpuchi nke ike ahụ (prāṇa-dēha). Mgbe anyị na-ekele ekele, idị asọ na akụkụ mkpuchi nke uche ahụ na-abawanye(manodēha). Ya mere, ekpere, etinyere inye ekele, na-eweta nsachapu ihe mkpuchi  ime mmụọ nke ike na uche ahụ. N’ihi nsachapu ime mmụọ nke mkpuchi ike ahụ na mkpuchi uche ahụ, ihe nnweta dị na mkpuchi abụọ a amalite na-eme mmebi. Ka ihe nnweta a na-agbada, echiche maka onwe ya na-ebenata, ndọkwuru nke ihe ụwa na-ebenata. Nke a na-eme ka  aguu nke Chineke bawanye na ịchọ sike ka ya na Chineke  bụrụ  otu. Ọzọkwa, ka mkpuchi ndị a na- adị ọcha, ike adịghị mma enweghị ike ịbanye na ahụ ahụ. Jee na edemede nke Etu nkpọkụ si na asachapu ihe nnweta ndị a na uche anyị.
  • Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị na-anabata enweghị ikike iji na-egboo mkpa anyị n’onwe anyị ya mere, ka anyị na-ahụta onwe anyị ka ndị pere mpe, onwe anyị n’ebenata. Mgbe onwe anyị benatara enwe nkuni n’ọkwa ime mmụọ obere oge. Nke a na-eweta mbawanye nwa oge na akụkụ ịdị nsọ dị omimi. וֹganihụ, mgbe anyị na-enye ekele, ọ na-emeputa umeala n’ime anyị nke nwere karịa nnukwu ihe dị mma n’ọkwa ime mmụọ anyị. N’ihi ya, nmekọrịta anyị na Chineke na-abawanye. Nkuni a n’ isi ịdị nsọ dị omimi n’onwe ya na-abawanye ịdị ike anyị iji merie ma ọ bụ nabata nsogbu ahụ.

3. Kedu mgbe ekpere anyị ji arụ ọrụ?

Na ndụ anyị, iri isii na ise% nke ihe omume na-eme dị ka akara-aka si dị. Ihe omume akara-aka bụ ihe omume ndị  anyị apụghị igbochi. Biko jee na edemede nke akara aka na ihe anyị metara.

Omume akara-aka, ma nke dị mma ma nke njọ, na-eme na  ndụ anyị. Ihe omume dị njọ nke akara aka nwere ike ịbụ ọrịa ma ọ bụ alụm dị na nwunye dị njọ. Onye nọ na etiti na-ekpe karị  ekpere mgbe ihe njọọ mere na ndụ ha. Ha na-ekpere Chineke ka o wepụrụ ha ihe omume dị njọ. Otu ọ dị, anyị  na-achọpụta na ekpere anyị anaghị enweta ọsịsa mgbe nile. Jee na edemede: Akara aka dịka mgbọrọgwụ ime mmụọ na-ịweta nsogbu na ndụ.

Yabụ gịnị bụ iwu? Kedu mgbe ekpere ji agafe omume akara aka dị njọ ka site na- ekpere, omume ahụ n’onwe ya agaghị emezi ma ọ bụ opekata mpe anyị enwe nchekwaba site na ya?

Isi iwu bụ:

  • Ọ bụrụ na ekpere dị ike akarịa ike nke ihe omume  akara aka ahụ, mgbe ahụ a ga-aza ekpere.
  • Ọ bụrụ na ike nke  akara aka karịrị  nke ekpere, mgbe ahụ  a ga- aza ekpere ahụ n’otu akụkụ  ma ọ bụ azaghị ya ma ọlị.

4. Gịnị na-ekpebi ịdị ire nke ekpere mmadụ?

Ihe ndị na-esonụ na-agbakwunye na ịdị ire nke  ekpere:

  • Ọkwa ime mmụọ nke onye na-ekpe ekpere –ka ọkwa ime mmụọ dị elu, ka ekpere ha dịkwa ire karịa.
  • וֹdị mma nke ekpere- ma ekpere ahụ ọ bụ ka a na ekpe, osi na obi ma ọ bụ o nwere mmetụta ime mmụọ site na onye na-achọnụ.
  • Maka onye ka a na-ekpe ekpere (ya bụ,  ọ bụ nke onwe ya ma ọ bụ nke ndị ọzọ) – Mgbe anyị na-ekpe ekpere maka ndị ọzọ, ike ime mmụọ  a chọrọ na-ebu ibụ. Ka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ buru ibu na ogbe ana atụ anya ka ihe omume ahụ metụta, ka a chọkwara ike nke ime mmụọ buru ibu  iji wepụta ihe a chọrọ. Naanị ndị Nsọ nke usoro dị elu pụrụ ịmetụta mgbanwe n’etiti igwe mmadụ.
  • Onwe (Ego)– onwe dị ala na-etinye n’ịdị ire nke ekpere.
  • Kedu ụdị ọnọdụ ekpere (mudrā) mmadụ na-anọ ekpe ekpere? Nke a na-abụ nukwuu ihe maka ọtụtụ ndị mmadụ, dị ka ihe ndị a dị n’elu dị ntakịrị na ọtụtụ ndị mmadụ.

4.1 Ọkwa ime mmụọ nke mmadụ na ekpere

Ọkwa ime mmụọ nke onye na-ekpe ekpere bụ otu ezi ụzọ n’ime ihe eji ekpebi ịdị ire nke ekpere.

  • Maka ndị na-achọnụ ọkwa ime mmụọ ha karịrị iri isii%, a achọghị ekpere. Ha na-arụ site na mmetụta ime mmụọ dị ka ‘ka ihe nile mee ka uche Chineke.’ Ha na-enwe n’ezie ahụmahụ na ihe nile na ndụ ha na-eme ma na-abia site na amara nke Chineke. Uche ha na anọ mgbe ọbụla na ọnọdụ nke inye Chineke ekele. Ozigbo e nwetara ọnọdụ a  ekpere adịzịghị mkpa.
  • Ekpere nke ndị ọkwa ime mmụọ ha gbadakarịrị iri atọ% adịghị ike ma  ihe kachasị a na-ewetara ha bụ naanị nke uru uche. Nke a bụ maka na mkpuchi nke onwe dị bụrụ nukwu ibu iji meek a ekpere ha ruo ụkpụrụ chi.
  • N’ihi ya, anyị nwere ike ịhụ na ekpere na-arụ ọrụ nke ọma maka ndị mmadụ nọ na ọkwa ime mmụọ nke iri atọ%  ruo iri isii%.

Jee na edemede nke ‘Nkewa nke ọnụ ọgụgụ nke ụwa site na ọkwa ime mmụọ’.

Malite n’oge rụo n’oge, anyị na-anụ oku ndị mmadụ na-akpọ ka a gbakọọ ma kpe ekpere maka udo nke ụwa, ma ọ bụ ihe dị mma dịka mwetunata ịdị ọkụ nke okirikiri ụwa. Site n’akụkụ ihe ndị enwetara n’ezie,  nke a bụ mbọ kachasị uche na-agba. Nke a dị otu a maka na ihe ndị siri ike na-eme na ụwa nwere isi mbido siri ike n’ime mmụọ ma naanị ụzọ enwere iji mmerie ha bụ site na ịgba mbọ ime mmụọ nke ụmụ mmadụ dị elu nke ukwuu dị ka ndị nsọ nke usoro dị elu. Ya bụrụ na puku kwuru puku ndị mmadụ ( ndị nọ na ọkwa ime mmụọ nke etiti) gbakọtara ọnụ mee otu ekpere maka otu ihe na-eme na ụwa, ọ dị ka ọtụtụ ụmụ arụrụ na-anwale ibuli ogwe.

Detuo: Ndị ụfọdụ nwere ike na-eche na ọ bụrụ na ndị Nsọ nwere ike iweta ngbanwe okirikiri ụwa, mgbe ahụ gịnị mere na ha apụghị ime ka e nwe udo na ụwa ma ọ bụ mbenata na-adịm ọkụ nke okirikiri ụwa? Ihe ngbagha ahụ bụ na ebe ndị nsọ nwere ike ime mmụọ na- emetụta ihe omume ụwa, ha nwere mmetụta ime mmụọ na naanị Chineke ma nke kachasị mma. Ọzọkwa, dị ka ha nọ ‘n’ọnọdụ nkiri’(sakshibhāv), site na udi ọdịdị ha, ha adịghị etinye aka na ntule Chineke ha nọ na-izu zu oke na atumatu Ya. Ha mara nke ọma na dị ka atụmatụ Chineke si dị, ihe nile na-eme dị ka nchụso(akara aka) onye ọ bụla  na nke njikota aka. (Ihe ndị akara aka bụ ihe omume ndị ahụ na ndụ anyị nke na-eme  n’ihi omume anyị gara aga, ma ọ bụ n’afọ ọmụmụ a ma ọ bụ na ọmụmụ ọmụmụ ndị mbụ)

5. Kedu ọnọdụ kacha mma maka ịnọ kpe ekpere na otu esi ekpe ekpere?

Site na nnyocha ime mmụọ, SSRF chọpụtara ma kwado ọnọdụ na-esonụ ma ọ bụ mudra, ya bụ nke kachasị mma iji nweta ike kachasị ike site n’ekpere.

Ihe osise ndị a enwatara site na ọmụma dị omimi na-egosi ụdị ọnọdụ abụọ na ihe n’ezie na-eme n’ọnọdụ ime mmụọ mgbe mmadụ na-ekpe ekpere.

5.1 Nkọwa ọnọdụ mbụ nke ekpere

Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?

Ihe nke mbu n’ọnọdụ a bụ ikpo aka na abụọ n’ekpere mee ka eze mkpịsị aka abụọ ejikoro ọnụ na-emetụta etiti iru ihu chakra (Ādnyā-chakra)(ike nke ime mmụọ dị na mpaghara etiti iru ihu). Ọ kachasị mma imalite ekpere mgbe anyị nọ n’ọnọdụ a.

Mgbe anyị na-ehulata isi anyị n’ọnọdụ ekpere a, ọ na-eme ka anyị nwe mmetụta ime mmụọ nke ịtọgbọ  na ime onwe anyị. Nke a, na mmegharị, na-eme ka ikikere kwesịrị ekwesị dị omimi nke chi dị iche iche sitere na Eluigwe na Ala rụọ ọrụ. Ihe ikikere Chineke ndị a dị omimi na-abata site na ọnụnụ mkpịsị aka anyị, nke na-arụ ọrụ dị ka nnabata. Ikikere Chineke ndị a mgbe ahụ na-esite na mkpịsị isi aka anyị na-abanye n’ime ahụ anyị site na etiti iru ihu chakra. Ihe a na- enweta bụ mbawanye n’ike ime mmụọ dị mma n’ime anyị, nke na-eme ka anyị na-enwe mmetụta dị mfe ma ọ bụ na-enye aka site na mgbama nke nsogbu anụ ahụ ma ọ bụ nke uche.

5.2 Nkọwa ọnọdụ abụọ nke ekpere

Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?

Mgbe mmadụ kpesiri ekpere, onye ahụ kwesiri ịnọ na ọnọdụ mudra nke abụọ dị ka egosiri na ihe osise dị na elu e nwetara site na amamihe dị omimi. Nke a pụtara na kama iwetulata aka gi ozigbo mgbe I nọ na-ekpere, I ga-edebe ha na mpaghara etiti obi etu ikpo aka ga na-emetụta obi. Nke a na-eme ka usoro nke ejị na-adọrọcha inọgịde na-echiche Chineke (Chaitanya) nke ụkpụrụ chi ahụ. Ya mere na nmalite, echiche Chineke nke ụkpụrụ chi ahụ nke banyegoro na ọnụ ọnụ mkpịsị aka ugbu a na-ebutekwa ya na mpaghara nke obi, oche nke obi chakra (Anāhat-chakra). Etu ọ dịkwa n’etiti iru ihu chakra, chakra nke obi na-adọrọkwa ikikere nsọ (sattvik frequencies). Site na- mmetụta ikpo aka na obi, chakra nke obi amalite ịrụ ọrụ ma nye aka na-adọta kwu ikikere nsọ (sattvik frequencies). Mgbe o bidoro ịrụ ọrụ, chakra nke obi na-akpọte mmetụta ime mmụọ nke ndị na-achọnụ na nraranye.

Na ụdị ọnọdụ ekpere a mudra, mmadụ kwesiri ka o buru onye n’echeghari uche n’ime onwe ya na n’ile anya n’iru Chineke banyere ahụmahụ nke ịbụ onye ọnụnọ Chineke.

5.2.1 Etu esi ekpe ekpere – ọnọdụ isi dị mma mgbe a na-ekpe ekpere

Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?
Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?

Ihe ndeba maka etu esi ekpe ekpere n’ụzọ ziri ezi:

  • E kwesịrị ihulata isi ala ma ghara iguso ọtọ.
  • Mkpịsị aka kwesịrị ịnọ dịka egedege ihu nọ, Mkpịsị aka kwesịghị ịsi ike kama ọ ga-dị jụụ.
  • Mkpịsị aka kwesịrị ịdị na-emetụta ibe ha – Ghara ịgbasaa.
  • Eze mkpịsị aka kwesịrị ịmetụ mpaghara etiti iru ihu chakra.
  • Aka abụọ ga-ejikọ ọnụ nwayọ enwe obere oghere n’etitu ọbụ aka. A bịa na ndị na-achọnụ ọkwa ime mmụọ ha karịrị iri ise%, a chọghị ohere n’etitu ọbụ aka.

5.3 Mgbe a na-ekpe ekpere nwere mmetụta ime mmụọ

Ihe osise na-esonu sitere na ọmụma dị omimi na-egosi ihe na-eme mgbe mmadụ nọ na ọkwa ime mmụọ iri ise% na-ekpe ekpere nwere mmetụta ime mmụọ. Isi ihe a ga-amata bụ na ndị nọ n’ogbe ahụ na-enwetakwa uru nke amamihe Chineke onye ahụ na-enweta. ( jee na akụkụ nke ihe osise sitere na ọmụma dị omimi nke na-egosi ikikere ise% nke ọmụma Chineke a na-ebufe na mpụga ahụ). Nke a mere e ji ahụkarị oge ọ bụla na mgbe ndị mmadụ na ekpe ekpere na enwe mmetụta ime mmụọ, mmetụta ime mmụọ nke ndị ọzọ nọ n’ogbe ahụ na- amalite ịrụ ọrụ.

Kedu ka Ekpere si arụ ọrụ na Kedu ka esi ekpe epkere?

5.4 Nke a ọ pụtara na oge ọbụla anyị na-ekpe ekpere na anyi kwesịrị ịnọ n’ọnọdụ a?

Ọ bụrụ na ọ bụ onye nọ n’ọkwa ime mmụọ dị elụ (karịrị iri ise%), Ihe omimi ikikere Chineke ka ọ na-amilite nwetaba ọkpakpa site na Brahmarandhra onwe ya. Brahmarandhra bụ ohere dị omimi –mepere n’elu chakra okpu (Sahasrār-chakra) (otu ọ dị na ọka mmụta nke ime mmụọ nke Kunḍalinīyoga) nke nwere ike ịbanye na uche na amamihe zuru Ụwa oke. Ohere miri emi a mechiri emechi na ndị nwere ọkwa ime mmụọ dị ala. Ihe mbu mbu na-enye aka na mmepe nke Brahmarandhra a bụ ọkwa nke onwe dị ala. Mgbe anyị nọ na ebe a n’ uto nke ime mmụọ, mkpa ọ dị maka ọnọdụ ekpere ndị a dị ka a kọwara n’elu na-epewanye mpe.

Otu ọdị, ọ bụrụ na onye nọ n’etiti ọkwa ime mmụọ nke iri ise% na iri asatọ% gbakwunye na ekpere ya ọnọdụ nke e nyere ya, mgbe ahụ ọ ga-enweta uru nke ngbakwuenye ọmụma Chineke. Uru ngbakwunye a bụ iri atọ% karịa ma abịa na onye nọ n’ọkwa ime mmụọ iri ise% ma ọ na-adịwanye mpe ka ọkwa ime mmụọ na-abawanye.

Ebe ọtụtụ ndị mmadụ enweghị ọkwa ime mmụọ dị elu, ha enweghị ike inweta ikikere Chineke site na Brahmarandhra. Ọtụtụ ndị mmadụ (ọkwa ime mmụọ iri atọ – iri isii%) bụ, otu ọ dị, ndị nwere ike inweta ikikere dị omimi site na ọnụ mkpịsị aka ha (ma ọ naghị ebu ebu), dị ka ọnụ mkpịsị aka anyị dị ngwa ngwa na-inweta ma ọ bụ zipuike dị omimi. Ihe ndị ọzọ nile fọdụrụ ha mha, site na-ikpe ekpere na-anọ n’ọnọdụ  ekpere a chọrọ, onye ahụ na-agbakwunye iri abụọ% n’ịdị ire nke ekpere ha dị ka mgbe o jighị ọnọdụ a.

5.5 Ntule ịdị ire nke ọnọdụ ekpere

Anyị na-ahụ ihe dị iche iche aka na-eme mgbe anyị na-ekpe ekpere. Mgbe a na-eme enyocha ime mmụọ n’ime ọnọdụ aka dị iche iche (mudras) nke ekpere, ihe ndị a na-esonu bụ ihe anyị chọpụtara na ịdị ire:

dị ire nke ọnọdụ ekpere dị iche iche

Ọnọdụ Ekpere Ntule uru
ime mmụọ1
Ogo nke ike dị mma a na-enweta2 Oke nke ike dị
mma a na-enweta3
Itinye anya nke ike
adịghị mma4
asatọ% elu elu iri atọ% abụọ%
anọ% etiti iri% anọ%
abụọ% ala ise% ise%
abụọ% ala ise% ise%

Ndeba:

  1. Otu narị% bụ na-enweta uru ime mmụọ zụrụ ezụ, nke na-eweta ịdị ka Chineke.
  2. Ogo nke ụkpụrụ chi a na-ahụ, ya bụ, chi dị elu elu, etiti ma ọ bụ ala.
  3. Ọnụ ọgụ nke ụkpụrụ chi a na-enweta.
  4. Nke a na-egosi inwe ike nke ike adịghị mma  igbochi ekpere ka o wee wetuo okwukwe nke onye na- achọnụ. Ike adịghị mma na-egbochi ekpere ka ekpere ghara inwe ọsịsa, ka ọ bụrụ na eletụrụ okwukwe onye ahụ anya.

Mee nyocha dị omimi n’onwe gi, ebe ị ga- ekpe otu ekpere were ọnọdụ ọ bụla nke dị n’elu kpee iche iche.

N’ihe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ejiko aka ekpe ekpere. Nke a bụkwa omume ime mmụọ adịghị mma maka  na ọ bụrụ na onye nọ anyị n’akụkụ na-enwe mmekpa ahụ nke ike adịghị mma, ike ojii ahụ ga-esi n’onye ahụ banye na anyị.

Jee n’edemede nke Ole bụ ọnụ ọgụ nke ndị mmadụ n’ụwa na-enwe mmekpa ahụ nke ike adị mma?

6. Isi nkpokota okwu nọ na ka ekpere si arụ ọrụ

  • A na-esi n’ọkwa ime mmụọ nke mmadụ na-amata ma onye ahụ na-ekpe ekpere maka uto ime mmụọ ka ọ bụ maka uru nke ụwa. Site na ụdị ekpere, chi dị elu ma ọ bụ chi dị ala na-aza ekpere onye ahụ dị ka osi dị.
  • Mmetụta ime mmụọ nke eji ekpe ekpere na-eweta ihe dị mma na-ịdị ire nke ekpere onye ahụ.
  • Site n’ụdị ọnọdụ e ji , uru a na-enweta site na-ekpere nwere ike ịdị iche iche.
  • Ihe ndị ọzọ nile hara mha, inọ n’ụdị ọnọdụ ekpere nke a chọrọ na-enye aka na-ime ka ohere nke iza ekpere onye ahụ bawanye iri abụọ%.
  • Ekpere nke dị nọ n’ọkwa ime mmụọ dị ala kpere maka ihe gbasara ọnụ ọgụgụ ụwa, dị ka udo ụwa ma ọ bụ mbenata na ịdị ọkụ nke okịrịkịrị ụwa, enyeghị aka.
  • Mgbe mmadụ na-ekpe ekpere na-enye ekele, ọ na-enye aka na-ibawanye ịdị ire nke ekpere onye ahụ.